ONULU UBE NWANNE

 Lyrics

By Jennifer

Obu gịnị ka mmelu iji kpụrụ m n onu
Obu gịnị ka mmelu iji kpo mụ asị
Okwa mụ na gị bu nwanne, onye jebe okporo ibe ya
Onye iro bịa we tinye ọ gbaghara
Na mụ na gị bụ nwanne, onye ri be onye tu ibe ya
Na ọkwa nwanne ozu na awụ ozu arụ (Aje!)
Agbụ gba na me eeh he, na mụ na nwanne m edozi go
Agbụ gba na me eeh eh eh eh he,
Na mụ na nwanne m edozi go

Iwe gị dị ọkụ dajụọ (ọ dị na obi mụọ oh!)
Onulu Ube, Onulu Ube, Onulu Ube Nwanne Agbana Oso
Onulu Ube, Onulu Ube, Onulu Ube Nwanne Agbana Oso
Ákwá nwanne yi ná ebe, Ona e mekwa gi na obi? (hey ya ah!)
Izuu ka mma na nneji ka ịma lụ, ma ná ina agba nwanne gị ama
Nkà ari rịa aga eri zi ọ nwe fa (mba nụ)
Igbo n’ile bu nwanne, onye jebe odulu ibe ya
Chukwu ekwe na ndị iro mụọ anyi amụ
Na mụ na gị bụ nwanne, onye ri be onye tu ibe ya
Na ọkwa nwanne ozu na awụ ozu arụ

Agbụ gba na me eeh he, na mụ na nwanne m edozi go
(Igbo unu ana a nụkwa ọnụ mụ o. Unu ana anụ?)
Agbụ gba na me eeh eh eh eh he, na mụ na nwanne m edozi go
Iwe gị dị ọkụ dajụọ biko! (ọ dị na obi mụọ oh!)
Onulu Ube, Onulu Ube, Onulu Ube Nwanne Agbana Oso
Onulu Ube na mụ na yi bu nwanne o
( Agbana Oso)
Iwe nwanne eru na ọkpụkpụ ife m melu gi gbahara o
(Onulu Ube Nwanne Agbana Oso)
Nwanne maru nwanne na mbọ si nwanne oyi ana a
(Onulu Ube Nwanne Agbana Oso)
Aye e mama ina anụ ka ogene m na aha
(Onulu Ube Nwanne Agbana Oso)
Ayee e ugo eze na o mu na ekwu
(Onulu Ube Nwanne Agbana Oso)
Maka nwanne amaka dọọ
Na nwanne amaka dọọ

(Onulu Ube Nwanne Agbana Oso)
Maka nwanne amaka dọọ
Na nwanne amaka
(Onulu Ube Nwanne Agbana Oso)
Agbụ gba na me eeh he, na mụ na nwanne m edozi go
Na mụ na yi bu nwanne
Agbụ gba na me eeh eh eh eh he, na mụ na nwanne m edozi go
Iwe gị dị ọkụ dajụọ biko! (ọ dị na obi mụọ oh!)
Onulu Ube, Onulu Ube, Onulu Ube Nwanne Agbana Oso!

BE UNIQUE! 

Comments

Popular posts from this blog

OTHER'S OPINION.